II. NDI KỌRINT 2:14-15
II. NDI KỌRINT 2:14-15 Bible Nso (IGBOB)
Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n'ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n'aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n'ebe nile. N'ihi na ayi bu isìsì utọ nke Kraist n'ebe Chineke nọ, n'etiti ndi anāzọputa, na n'etiti ndi nāla n'iyì
Kesaa
Gụọ II. NDI KỌRINT 2II. NDI KỌRINT 2:14-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya. Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi.
Kesaa
Gụọ II. NDI KỌRINT 2