II. NDI KỌRINT 4:16-17
II. NDI KỌRINT 4:16-17 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi. N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi
Kesaa
Gụọ II. NDI KỌRINT 4II. NDI KỌRINT 4:16-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu.
Kesaa
Gụọ II. NDI KỌRINT 4