Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 12:6 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌLU NDI-OZI 12:6 IGBOB (Bible Nso)

Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ.

ỌLU NDI-OZI 12:6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.