ỌLU NDI-OZI 5:38-39
ỌLU NDI-OZI 5:38-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, agwa m unu, hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya. Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”
Kesaa
Gụọ ỌLU NDI-OZI 5ỌLU NDI-OZI 5:38-39 Bible Nso (IGBOB)
M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala: ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.
Kesaa
Gụọ ỌLU NDI-OZI 5