Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 5:25-28 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

DANIEL 5:25-28 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin “Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe. “Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ. “Parsin, ekewala alaeze gị nyefee ya nʼaka ndị Midia na Peshịa.”

DANIEL 5:25-28 IGBOB (Bible Nso)

Ma nka bu ihe-odide ahu nke akarari, MENE, MENE, TEKEL, UFASIN. Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue. TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi. PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia.