Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 8:19-21 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

DANIEL 8:19-21 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka. Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa. Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ.

DANIEL 8:19-21 IGBOB (Bible Nso)

O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile. Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia. Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.