DEUTERONOMI 11:26-28 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
DEUTERONOMI 11:26-28 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị ONYENWE ANYị na ọbụbụ ọnụ. Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu ONYENWE ANYị Chineke unu, nke m na-enye unu taa. Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke ONYENWE ANYị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị.
Kesaa
DEUTERONOMI 11 BIUDEUTERONOMI 11:26-28 IGBOB (Bible Nso)
Le, mu onwem nētiye n'iru unu ta ngọzi na nkọcha; ngọzi ahu, ma asi na unu ege nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta: ma nkọcha ahu, ma ọ buru na unu egeghi nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, ma unu ewezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ka unu we jeso chi di iche iche ọzọ, nke unu nāmaghi.
Kesaa
DEUTERONOMI 11 IGBOB