DEUTERONOMI 26:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
DEUTERONOMI 26:1-4 IGBOB (Bible Nso)
Ọ gēru kwa, mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, mb͕e i gēnweta kwa ya, we biri nime ya; na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n'abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu. I gābiakute kwa onye-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu, si ya, Egosiwom Jehova, bú Chineke-gi, ta, na abatawom n'ala ahu nke Jehova ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ayi. Onye-nchu-àjà gānara abọ ahu n'aka-gi, dọba ya n'iru ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi.
DEUTERONOMI 26:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya, ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ ONYENWE ANYị Chineke unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya. Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye ONYENWE ANYị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ ONYENWE ANYị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.” Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja ONYENWE ANYị Chineke gị.