NDI EFESỌS 3:16-19
NDI EFESỌS 3:16-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu; ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya. Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.
NDI EFESỌS 3:16-19 Bible Nso (IGBOB)
ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu; ka Kraist we site n'okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n'anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya, ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi, na imara ihu-n'anya Kraist nke kariri ọmuma nke-uku ri nne, ka ewe me ka unu zue ezù rue ozuzù nile nke Chineke.