ỌPUPU 10:1-2
ỌPUPU 10:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Jekwuru Fero nʼihi na emeela m ka obi ya, na obi ndị na-ejere ya ozi sie ike, ka m nwee ike rụọ ọrụ ịrịbama ndị a dị iche iche nʼetiti ha. Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ ONYENWE ANYị.”
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 10ỌPUPU 10:1-2 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Moses, Bakuru Fero: n'ihi na Mu onwem emewo ka obi-ya na obi ndi-orù-ya di arọ́, ka M'we tiye ihe-iriba-ama ndia n'etiti ha: ka i we kọ kwa na nti nwa-gi na nwa nwa-gi akukọ bayere emò M'kwara ndi Ijipt, na ihe-iriba-ama nile nke M'tiyere n'etiti ha; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 10