ỌPUPU 10:21-23
ỌPUPU 10:21-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị abụọ nʼeluigwe ka ọchịchịrị gbaa nʼala Ijipt niile.” Mosis setịpụrụ aka ya nʼeluigwe. Oke ọchịchịrị gbara abalị atọ nʼala Ijipt niile. Ndị Ijipt ahụghị ihu ibe ha. Ha ahapụghịkwa ebe obibi ha abalị atọ ahụ. Ma ụmụ Izrel nwere ìhè nʼebe niile ha bi.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 10ỌPUPU 10:21-23 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ọchichiri we b͕a n'elu ala Ijipt, bú ọchichiri agēbitu aka. Moses we setipu aka-ya n'iru elu-igwe; oké ọchichiri we di n'ala Ijipt nile ubọchi atọ; ha ahuritaghi ibe-ha anya, ọ dighi kwa onye si n'ebe ọ nọ bilie ubọchi atọ: ma umu Israel nile nwere ìhè n'ebe-obibi nile ha.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 10