ỌPUPU 12:12-13
ỌPUPU 12:12-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m ONYENWE ANYị. Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt.
ỌPUPU 12:12-13 Bible Nso (IGBOB)
M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova. Ọbara ahu gāburu unu ihe-iriba-ama n'aru ulo nile ebe unu onwe-unu nọ: mb͕e M'huru ọbara ahu, M'gāgabiga unu, ọ dighi kwa ihe-otiti gādi n'aru unu ibu ihe-nbibì, mb͕e M'nētib͕u ndi bi n'ala Ijipt.