ỌPUPU 15:23-25
ỌPUPU 15:23-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.) Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?” Mosis tikuru ONYENWE ANYị mkpu akwa. ONYENWE ANYị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka ONYENWE ANYị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.
ỌPUPU 15:23-25 Bible Nso (IGBOB)
Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara. Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu? Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha