ỌPUPU 34:6-7
ỌPUPU 34:6-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “ONYENWE ANYị, ONYENWE ANYị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”
ỌPUPU 34:6-7 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gabiga n'iru ya, kpọ òkù, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi-ebere, Onye nēme amara, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere na ezi-okwu; Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.