ỌPUPU 9:9-10
ỌPUPU 9:9-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.” Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 9ỌPUPU 9:9-10 Bible Nso (IGBOB)
Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile. Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 9