JENESIS 39:7-9
JENESIS 39:7-9 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwunye nke onye-nwe-ya weliri anya-ya abua lekwasi Josef, si, Ka mu na gi dina. Ma ọ juru, si nwunye nke onye-nwe-ya, Le, onye-nwem amaghi ihe di n'akam n'ulo, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyeworo n'akam; ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke?
JENESIS 39:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.” Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya. O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.”