Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

HOSEA 7:14 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

HOSEA 7:14 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.

HOSEA 7:14 IGBOB (Bible Nso)

Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.