HOSEA 9:7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
HOSEA 9:7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
Kesaa
HOSEA 9 BIUHOSEA 9:7 IGBOB (Bible Nso)
Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.
Kesaa
HOSEA 9 IGBOB