AISAIA 40:12-14
AISAIA 40:12-14 Bible Nso (IGBOB)
Ònye tùworo miri nile n'ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tùputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mb͕é, sì ugwu nile n'ihe-osìsì, tùa ugwu ntà nile n'ihe-ọtùtù? Ònye tùputaworo ma-obu nke Jehova, ma-ọbu, dika onye-ndum-ọdu-Ya, nēme ka Ọ mara ihe? Yà na onye b͕ara ìzù? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye zíri Ya ihe n'okporo-uzọ ikpé, zí kwa Ya ihe-ọmuma, me kwa ka Ọ mara uzọ nghọta?
AISAIA 40:12-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta? Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke ONYENWE ANYị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe? Ọ bụ onye ka ONYENWE ANYị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe, ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma? Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma, maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?