AISAIA 43:20-21
AISAIA 43:20-21 Bible Nso (IGBOB)
Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n'ihi na enyewom miri n'ọzara na osimiri di iche iche n'ala tọb͕ọrọ n'efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M'rọputara: ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.
Kesaa
Gụọ AISAIA 43AISAIA 43:20-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
Kesaa
Gụọ AISAIA 43