Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 5:24 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

AISAIA 5:24 IGBOB (Bible Nso)

N'ihi nka dika ire ọku si erichapu ahihia-ọka, na dika ahihia nke kpọrọ nku si ada n'ọku nēnwu enwu, otú a nkpọrọgwu-ha gādi ka ihe nēre ure, ifuru-ha gāla kwa elu dika uzuzu: n'ihi na ha ajuwo iwu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu kwa okwu-ọnu nke Onye Nsọ nke Israel ka ha lelìworo.

Kekọrịta
AISAIA 5 IGBOB

AISAIA 5:24 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.

Kekọrịta
AISAIA 5 BIU