JEREMAIA 20:8-9
JEREMAIA 20:8-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu ONYENWE ANYị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.
JEREMAIA 20:8-9 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na mb͕e ọ bula m'nēkwu, etim nkpu; Ihe-ike na Ipunara-madu-ihe, ka m'nākpọ nkpu: n'ihi na okwu Jehova ghọrọm ihe-ita-uta na ihe-ikwa-emò ogologo ubọchi nile. M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike.