JOB 33:15-18
JOB 33:15-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha. O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị; ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya, ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.
Kesaa
Gụọ JOB 33JOB 33:15-18 Bible Nso (IGBOB)
Na nrọ, bú ọhù nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina; Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu, Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà, Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya, Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako; Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.
Kesaa
Gụọ JOB 33