JOEL 2:32 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JOEL 2:32 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha ONYENWE ANYị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka ONYENWE ANYị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ ONYENWE ANYị na-akpọ.
Kesaa
JOEL 2 BIUJOEL 2:32 IGBOB (Bible Nso)
Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Jehova, agēme ka o wepuga onwe-ya: n'ihi na n'ugwu Zaion na nime Jerusalem ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, dika Jehova siworo, na n'etiti ndi fọduru afọdu ka ndi Jehova nākpọ gādi.
Kesaa
JOEL 2 IGBOB