Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOEL 3:15-16 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JOEL 3:15-16 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè. ONYENWE ANYị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. ONYENWE ANYị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.

JOEL 3:15-16 IGBOB (Bible Nso)

Anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha. Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.