LUK 7:21-22
LUK 7:21-22 Bible Nso (IGBOB)
N'oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n'ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ. O we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu huru na nke unu nuru; ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi- ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.
LUK 7:21-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.