MALAKAI 2:16 - Compare All Versions
MALAKAI 2:16 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka ONYENWE ANYị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ ONYENWE Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Kesaa
MALAKAI 2 BIUMALAKAI 2:16 IGBOB (Bible Nso)
N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.
Kesaa
MALAKAI 2 IGBOB