MALAKAI 3:17-18 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MALAKAI 3:17-18 IGBOB (Bible Nso)
Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n'ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M'gēnwe kwa ọmiko n'aru ha, dika madu si enwe ọmiko n'aru nwa-ya nke nēfè ya. Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.
Kesaa
MALAKAI 3 IGBOBMALAKAI 3:17-18 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe,” ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “ha ga-abụ ihe oke ọnụahịa nke aka m. Aga m echebe ha, dịka nna na-enwe ọmịiko ma chebekwa nwa ya nwoke na-efe ya. Unu ga-ahụ ihe dị iche nʼetiti ndị ezi omume na ndị ajọ omume, hụkwa ihe dị iche nʼetiti ndị na-efe Chineke na ndị na-adịghị efe ya.
Kesaa
MALAKAI 3 BIU