MATIU 18:23-35
MATIU 18:23-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri. Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji. “Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’ Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ. “Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’ “Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ “Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. “Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. “Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”
MATIU 18:23-35 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie. Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise. Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ. Ya mere orù ahu dara n'ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi ihe nile. Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n'aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri. Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji. Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi. Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji. Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n'obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere. Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n'ihi na i riọrọm: ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere? Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n'aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji. Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n'obi-unu.