Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 2:16 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 2:16 IGBOB (Bible Nso)

Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.

Kekọrịta
MATIU 2 IGBOB

MATIU 2:16 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.

Kekọrịta
MATIU 2 BIU