MATIU 23:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 23:1-4 IGBOB (Bible Nso)
Mb͕e ahu Jisus gwara ìgwè madu nile na ndi nēso uzọ-Ya okwu, si, N'oche Moses ka ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nọduru: ya mere, ihe nile, ka ha ra, bú nke ha gāsi unu me, menu ihe ndia, debe kwa ha: ma unu emela dika ọlu nile ha si di; n'ihi na ha nēkwu, ma ha adighi-eme. Ma ha nēke ibu di arọ́ di kwa ike obubu, tukwasi ha n'ubu madu; ma ha onwe-ha achọghi iji otù nkpisi-aka-ha wezuga ha.
MATIU 23:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis. Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha.