MATIU 24:37-39
MATIU 24:37-39 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi. N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.
Kesaa
Gụọ MATIU 24MATIU 24:37-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa. Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya. Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.
Kesaa
Gụọ MATIU 24