MATIU 27:1-7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 27:1-7 IGBOB (Bible Nso)
Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua: ha we ke Ya ab͕u, dupu Ya, rara Ya nye n'aka Pailat onye-isi. Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu. O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya. Ndi-isi-nchu-àjà we nara ego ọla-ọcha nile, si, O zighi ezi n'iwu itubà ha n'ebe anēdebe ihe enyere Chineke, ebe ọ bu ọnu-ahia ọbara. Ha we b͕a ìzù, chiri ha zuta ubi ọkpu-ite, ilì ndi-ọbìa.
MATIU 27:1-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya. Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ. Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ. Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.” Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa.