Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 6:20-22 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 6:20-22 IGBOB (Bible Nso)

kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori: n'ihi na ebe àkù-gi di, n'ebe ahu ka obi-gi gādi kwa. Oriọna nke aru bu anya: ya mere ọ buru na anya-gi ele otù ebe, aru-gi dum gējuputa n'ìhè.

Kekọrịta
MATIU 6 IGBOB

MATIU 6:20-22 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe. Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa. “Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.

Kekọrịta
MATIU 6 BIU