NEHEMAIA 2:17-18
NEHEMAIA 2:17-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.” Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge.
NEHEMAIA 2:17-18 Bible Nso (IGBOB)
M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ. M'we gosi ha aka Chineke nke di nma n'arum; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwaram. Ha we si, Ka ayi bilie lua mb͕idi. Ha we me ka aka-ha di ike ime ezi ihe a.