NEHEMAIA 7:1-2
NEHEMAIA 7:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị. Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
Kesaa
Gụọ NEHEMAIA 7NEHEMAIA 7:1-2 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m'guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha, na m'nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n'ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu.
Kesaa
Gụọ NEHEMAIA 7