NEHEMAIA 9:19-21
NEHEMAIA 9:19-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile. I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha. Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.
NEHEMAIA 9:19-21 Bible Nso (IGBOB)
ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè. I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n'ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha. Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.