Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 21:4-9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌNU-ỌGUGU 21:4-9 IGBOB (Bible Nso)

Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije ga n'uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n'uzọ ahu. Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé. Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel. Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel. Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya. Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya.

ỌNU-ỌGUGU 21:4-9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a. Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.” Ya mere, ONYENWE ANYị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel. Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola ONYENWE ANYị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị ONYENWE ANYị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.” Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.