Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 4:7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌNU-ỌGUGU 4:7 IGBOB (Bible Nso)

N'elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n'elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n'elu ya

ỌNU-ỌGUGU 4:7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.