ILU 6:16-19
ILU 6:16-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ dị ụzọ ihe isii ONYENWE ANYị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ. Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe, onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
Kesaa
Gụọ ILU 6ILU 6:16-19 Bible Nso (IGBOB)
Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì; E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya: Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ; Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe, Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ; Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume, Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.
Kesaa
Gụọ ILU 6