Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 45:1-17

ABÙ ỌMA 45:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m, mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze; ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ. I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ, e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ, ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi. Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe. Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya. Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze; ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị. O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ. Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị. Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.” Ada Taịa ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma. Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya. Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze. E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze. Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile. Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.

ABÙ ỌMA 45:1-17 Bible Nso (IGBOB)

Obim ab͕ọputawo okwu di nma: Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze: Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa. Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike, Ebube-gi na ima-nma-gi. N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma, N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume: Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu. Àkú-gi nile bu ihe di nkọ; Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi; Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze. Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi: Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu. I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì: N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere gi Manu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi. Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile; Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu. Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia: Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia. Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala; Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi; Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike: N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya. Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia; Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua. Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru: Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu. N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze: Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya, Anēme ha ka ha biakute gi. Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha: Ha gābà n'ulo uku eze. Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà, I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile. M'gēme ka echeta aha-gi n'ọb͕ọ nile: N'ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.