NKPUGHE 22:1-21
NKPUGHE 22:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta, nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile. A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe. Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha. Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya. “Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ a.” Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya. Ma ọ sịrị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala.” Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso. Ka ndị niile na-eme ajọ omume gaa nʼihu na-eme ajọ omume, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nʼihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nʼihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nʼihu bụrụ ndị dị nsọ.” “Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka. Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ. “Ngọzị na-adịrị ndị ahụ sara uwe ha mmiri, ka ha si otu a bụrụ ndị na-enweta oke na mkpụrụ si nʼosisi ahụ na-enye ndụ, ndị ga-enwe ike isite nʼọnụ ụzọ ama ahụ baa nʼime obodo ahụ. Nʼazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị niile na-agba afa, na ndị niile na-akwa iko, na ndị niile na-egbu mmadụ, na ndị niile na-ekpere arụsị, na ndị niile hụrụ ụgha nʼanya ma na-emekwa ya. “Mụ onwe m, bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gbara unu ama a nye nzukọ m niile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ na Mkpụrụ Devid. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ na-enwu enwu.” Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a. Onye ahụ gbara ama ihe ndị a niile na-asị, “Nʼezie, ana m abịa ọsịịsọ.” Amen. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ niile. Amen.
NKPUGHE 22:1-21 Bible Nso (IGBOB)
O we gosim osimiri nke miri nke ndu, nēnwu dika crystal, ka ọ nēsi n'oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu puta, n'etiti amá-ya. N'akuku a na n'akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n'ọnwa n'ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike. Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè: ha gāhu kwa iru-Ya; aha-Ya gādi kwa n'egedege-iru-ha. Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi. O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà. Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a. Mu onwem Jọn bu kwa onye nānu nāhu kwa ihe ndia. Mb͕e m'nuru, hu kwa, m'we da n'ala ikpọ isi ala n'iru ukwu mọ-ozi ahu onye nēgosim ihe ndia. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke. O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso. Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru. Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu. Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu. N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya. Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu. Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù. Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a: ọ buru kwa na onye ọ bula gēwepu okwu nime okwu nile nke akwukwọ nke amuma nka, Chineke gēwepu òkè-ya n'osisi nke ndu ahu, wepu kwa òkè-ya n'obodo nsọ ahu, bú ihe edeworo n'akwukwọ a. Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus. Ka amara Onye-nwe-ayi Jisus diyere ndi nsọ nile. Amen.