NDI ROM 3:23-26 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 3:23-26 IGBOB (Bible Nso)
n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke; anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus: Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke; ka O we gosi ezi omume-Ya n'oge di ub͕u a, ka m'kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n'onye ezi omume, bú onye nọ n'okwukwe ekwere na Jisus.
NDI ROM 3:23-26 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke. Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs. Onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya. Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs.