Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

RUT 1:20-21 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

RUT 1:20-21 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu. Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma ONYENWE ANYị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na ONYENWE ANYị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.”

RUT 1:20-21 IGBOB (Bible Nso)

_O si ha, Unu akpọlam Naomi, kpọnum Mara: n>ihi na Onye Nke puru ime ihe nile meworom ihe-ilu nke-uku. Mu onwem, n>aka-ojuju ka m>jere, ma Jehova emewo ka m>b͕ara aka lata: n>#ihi gini ka unu n=akpọm Naomi, mb͕e Jehova b͕agiderem #am#a, Onye Nke puru ime ihe nile emejọwokwam?