ZEKARAIA 13:9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ZEKARAIA 13:9 IGBOB (Bible Nso)
M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.
Kesaa
ZEKARAIA 13 IGBOBZEKARAIA 13:9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ. Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha, jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo. Ha ga-akpọku aha m, aga m azakwa ha. Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’ Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị.’ ”
Kesaa
ZEKARAIA 13 BIU