ZEKARAIA 8:16-17 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ZEKARAIA 8:16-17 IGBOB (Bible Nso)
Ndia bu ihe unu gēme; Kwuenu, onye ọ bula ọ gwa ibe-ya, ezi-okwu; Kpenu ikpe ezi-okwu na ikpe udo n'ọnu-uzọ-ama nile unu: unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide ibe-ya; unu ahu-kwa-la ọb͕ub͕a-iyi ugha n'anya: n'ihi na ihe ndia nile bu ihe nke M'kpọworo asì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Kesaa
ZEKARAIA 8 IGBOBZEKARAIA 8:16-17 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo. Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya.
Kesaa
ZEKARAIA 8 BIU