Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ZEKARAIA 9:10 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ZEKARAIA 9:10 IGBOB (Bible Nso)

M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

ZEKARAIA 9:10 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem, na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem; a ga-agbajikwa ụta agha. Ọ ga-ewetara mba niile udo, ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.