1
Ọrụ Ndị Ozi 1:8
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 1:8
2
Ọrụ Ndị Ozi 1:7
Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 1:7
3
Ọrụ Ndị Ozi 1:4-5
Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m. Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 1:4-5
4
Ọrụ Ndị Ozi 1:3
Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 1:3
5
Ọrụ Ndị Ozi 1:9
Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 1:9
6
Ọrụ Ndị Ozi 1:10-11
Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 1:10-11
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị