1
Izikiel 12:28
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
“Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwubiri ya.’ ”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Izikiel 12:28
2
Izikiel 12:25
Ma mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwubiri ya.’ ”
Nyochaa Izikiel 12:25
3
Izikiel 12:2
“Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.
Nyochaa Izikiel 12:2
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị