1
Jeremaya 13:23
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Jeremaya 13:23
2
Jeremaya 13:16
Nyenụ ONYENWE ANYị Chineke unu nsọpụrụ. Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu; tupu unu akpọbie ụkwụ unu nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị. Unu na-ele anya ìhè ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị. Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ.
Nyochaa Jeremaya 13:16
3
Jeremaya 13:10
Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla.
Nyochaa Jeremaya 13:10
4
Jeremaya 13:15
Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na ONYENWE ANYị ekwuola ya.
Nyochaa Jeremaya 13:15
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị